Jump to content

Foluke Daramola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Foluke Daramola
mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoFolúkẹ́ Dárámọ́lá–Sàlàkọ́ Dezie
Aha ọmụmụFoluke Daramola Dezie
aha enyereFoluke Dezie
aha ezinụlọ yaDaramola Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya15 Febụwarị 1978 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ekiti Dezie
Dị/nwunyeKayode Salako Dezie
nwaIbukunoluwa Ayomikun Owolabi Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
ọrụ ọ na-arụomee ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri, omee, omee, onye nhazi ndu ihe nkiri Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọObafemi Awolowo University, Ikeja Senior High School, University of Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1998 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
onye nlereranyaTunde Kelani, Amaka Igwe, Lola Fani-Kayode Dezie
ahọpụtara makaAfrica Movie Academy Award for Best Actress in a Supporting Role Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

 

Foluke Daramola-Salako Audio  bụ nwaafọ Naijiria na- eme ihe nkiri. A họpụtara ya maka onyinye ihe nkiri Africa Movie Academy for Best Actress in a Supporting Role n'afọ 2013.

Mmalite ndụ na ọrụ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Daramola n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Febụwarị. Ọ bụ onye gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Obafemi Awolowo . N’afọ 1998, o mere ihe nkiri izizi ya n’ime ihe nkiri usoro a kpọrọ Palace . [1] Ọ pụakwara na Durodola na Above Law . N'afọ 2016, a kọrọ na nwa ya nwanyị bụ onye nhazi nke ihe ngosi onyonyo. [2] Ihe nkiri ya, Cobweb, nke o rụpụtara ma pụtakwa na ya, nwetaara ya nhọpụta Africa Movie Academy Awards Best Supporting Actress. O kwuru na ihe nkiri ahụ sitere n'ahụmahụ ya, n'ihi na ndị mụrụ ya achọghị ka ya tinye aka na ime ihe nkiri mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ. [3] Ọ bụ onye bidoro "Action Against Rape in Africa", bu atụmatụ nke na acho i gbochi ị wakpo mmadụ n'ike, ma mee ka ndi kpara agwa a n'Afrika gaa mkpọrọ. [4]

Ndụ onwe

[dezie | dezie ebe o si]

N'ajụjụ ọnụ nke afọ 2016, o kpughere na e dinara ya n'ike mgbe ọ dị afọ iri na ụma. [5] [6] [7] N'ajụjụ ọnụ ya na Tribune, ọ kọwara na ụmụ nwanyị kwesịrị ị ma uru ha bara na ị dabere na di ha maka ego. O kwuru na tigbuo-zọgbuo n'ezinụlọ bụ mbibi ka ukwuu n'ụlọ ya, karịa ekwesịghị ntụkwasị obi. [8] N’afọ 2017, o kwuru n’ihu ọha maka ịdị umeala n’obi nke Aliko Dangote, na-akọwa ya dịka “onye kacha umeala n’obi n’ụwa ”. [9]

Na mkparịta ụka nke ọnwa Maachị nke afọ 2018 na The Punch (Legọs, Naijiria), Daramola-Salako kwuru na ya na-ele nnukwu ara ya anya dị ka akụ na ụba ọ bụghị ọbụbụ ọnụ: “Ihe mbụ na-adọrọ mmasị ọtụtụ ndị nwoke na-abịakwute m na-abụkarị ihe mmekọahụ. Ha na-ahụ nnukwu ara m, ọ na-akpali ha ozugbo. Mana dika mmadu, Agaghị m eso nwoke ọ bụla pụọ n'ihi na mmasị ha na-adọrọ m n'ihi na a maara m na ọ bụ ihe nkịtị. N'ebe m nọ, ụmụ nwanyị kwesịrị ị kwụsị ịhụ 'akụ' ndị a dị ka nsogbu ma were ha dị ka ngọzi. Ọ bụ naanị site n’ime otú ahụ ka ha ga-ama etu ha ga-esi na-ebu onwe ha nke ọma. Ha kwesịrị i bu onwe ha nke ọma, ka ihere ghara ime ha. ” [10]

Nrụtụaka

[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  • Foluke Daramola on IMDb